Abụ Ọma 36:2
Psalms 36:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.
Psalms 36:2 in English
Psalms 36:2 · Berean Standard Bible
For his eyes are too full of conceit to detect or hate his own sin.
Context
1E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke
banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe:*
Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke
dị nʼanya ha. 2Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha,
na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị. 3Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;
ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma. 4Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe;
ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume,
ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.