Native Bible

Psalms 30:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị,

Psalms 30:8 in English

Psalms 30:8 · Berean Standard Bible

To You, O LORD, I called, and I begged my Lord for mercy:

Context

6Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.” 7O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba. 8Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị, 9“Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?” 10O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.