Abụ Ọma 22:28
Psalms 22:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.
Psalms 22:28 in English
Psalms 22:28 · Berean Standard Bible
For dominion belongs to the LORD and He rules over the nations.
Context
26Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha,
ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya
ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,
ma laghachikwute Onyenwe anyị.
Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche
ga-akpọ isiala nʼihu ya. 28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,
ọ na-achịkwa mba niile. 29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;
ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;
ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. 30Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;
a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.