Native Bible

Psalms 22:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Psalms 22:26 in English

Psalms 22:26 · Berean Standard Bible

The poor will eat and be satisfied; those who seek the LORD will praise Him. May your hearts live forever!

Context

24Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya. 25Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. 26Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya. 28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.