Abụ Ọma 22:29
Psalms 22:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
Psalms 22:29 in English
Psalms 22:29 · Berean Standard Bible
All the rich of the earth will feast and worship; all who go down to the dust will kneel before Him— even those unable to preserve their lives.
Context
27Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta,
ma laghachikwute Onyenwe anyị.
Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche
ga-akpọ isiala nʼihu ya. 28Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị,
ọ na-achịkwa mba niile. 29Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya;
ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya;
ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. 30Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi;
a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị. 31Ha ga-ekwusa ezi omume ya
nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị
nʼihi na o meela ya.
22:2 Maọbụ, Nʼabalị, adịghị m emechikwa ọnụ m
22:12 Bashan bụ obodo e ji oke ehi gbara abụba ma dịkwa ike maara. Ọ dị na mpaghara ugwu nʼọwụwa anyanwụ ala Filistia. Dit 3:1; Ems 4:1
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.