Native Bible

Psalms 19:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.

Psalms 19:6 in English

Psalms 19:6 · Berean Standard Bible

it rises at one end of the heavens and runs its circuit to the other; nothing is deprived of its warmth.

Context

4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ. 5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi. 6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya. 7Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.