Abụ Ọma 19:6
Psalms 19:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
Psalms 19:6 in English
Psalms 19:6 · Berean Standard Bible
it rises at one end of the heavens and runs its circuit to the other; nothing is deprived of its warmth.
Context
4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.
Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ. 5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,
dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi. 6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,
bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya. 7Iwu Onyenwe anyị zuruoke;
ọ na-eweghachi mkpụrụobi.
Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;
ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,
ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ.
Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,
ọ na-enye anya ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.