Abụ Ọma 19:4
Psalms 19:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
Psalms 19:4 in English
Psalms 19:4 · Berean Standard Bible
their voice * has gone out into all the earth, their words to the ends of the world.* In the heavens He has pitched a tent for the sun.
Context
2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu,
ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. 3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,
ma a na-anụ ụda ha. 4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.
Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ. 5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,
dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi. 6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,
bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.