Abụ Ọma 19:5
Psalms 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
Psalms 19:5 in English
Psalms 19:5 · Berean Standard Bible
Like a bridegroom emerging from his chamber, like a champion rejoicing to run his course,
Context
3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,
ma a na-anụ ụda ha. 4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.
Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ. 5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,
dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi. 6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,
bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya. 7Iwu Onyenwe anyị zuruoke;
ọ na-eweghachi mkpụrụobi.
Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;
ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.