Abụ Ọma 19:7
Psalms 19:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
Psalms 19:7 in English
Psalms 19:7 · Berean Standard Bible
The Law of the LORD is perfect, reviving the soul; the testimony of the LORD is trustworthy, making wise the simple.
Context
5Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,
dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi. 6Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,
bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya. 7Iwu Onyenwe anyị zuruoke;
ọ na-eweghachi mkpụrụobi.
Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;
ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. 8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,
ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ.
Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,
ọ na-enye anya ìhè. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,
ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,
ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.