Abụ Ọma 18:4
Psalms 18:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
Psalms 18:4 in English
Psalms 18:4 · Berean Standard Bible
The cords of death encompassed me; the torrents of chaos overwhelmed me.
Context
2Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. 3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto,
ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 4Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;
ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. 5Ụdọ nke ili kere m gburugburu,
ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 6Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;
etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka;
akwa m rutekwara ya ntị,
o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.