Native Bible

Psalms 18:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.

Psalms 18:3 in English

Psalms 18:3 · Berean Standard Bible

I will call upon the LORD, who is worthy to be praised; so shall I be saved from my enemies.

Context

1O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. 2Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. 3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 4Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. 5Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.