Abụ Ọma 149
Psalms 149 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Toonu Onyenwe anyị!
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.
Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. 2Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;
ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze* ha. 3Ka ha jiri ite egwu too aha ya
ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 4Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
Ọ na-eji nzọpụta* kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. 5Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,
bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. 6Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,
ka mma agha ihu abụọ* dịrịkwa nʼaka ha, 7iji bọọrọ mba niile ọbọ
taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ, 8iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha
na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe, 9imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.
Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.
Toonu Onyenwe anyị.
149:2 Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5
149:4 Abụ 132:16; Aịz 61:10
149:6 Hib 4:12; Mkp 1:16
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.