Native Bible

Psalms 141 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 141
1O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị. 2Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị. 3Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche. 4Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.* 5Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ. 6A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu. 7Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” 8Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ. 9Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m. 10Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla. 141:4 Ilu 23:6

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.