Abụ Ọma 141:3
Psalms 141:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.
Psalms 141:3 in English
Psalms 141:3 · Berean Standard Bible
Set a guard, O LORD, over my mouth; keep watch at the door of my lips.
Context
1O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ.
Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị. 2Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ;
ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị. 3Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị;
na-echekwa egbugbere ọnụ m nche. 4Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ,
isonye ndị na-eme ihe ọjọọ
rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche;
ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.* 5Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere;
ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m.
Isi m agaghị ajụ ya.
Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.