Abụ Ọma 139:5
Psalms 139:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị.
Psalms 139:5 in English
Psalms 139:5 · Berean Standard Bible
You hem me in behind and before; You have laid Your hand upon me.
Context
3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;
ị mazukwara ụzọ m niile. 4O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu
tupu m kwuo ya. 5Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,
ị tụkwasịla m aka gị. 6Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,
ọ dịkwa elu apụghị m iru ya. 7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?
Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.