Abụ Ọma 133
Psalms 133 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Lee ka o si bụrụ ihe dị mma
na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!* 2Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,
nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,
e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,
ruokwa nʼolu uwe mwụda ya. 3Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon
na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.
Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,
ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
133:1 Hib 13:1
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.