Abụ Ọma 134
Psalms 134 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile
ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị. 2Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya*
ma toonu Onyenwe anyị. 3Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa
site na Zayọn gọzie unu.
134:2 1Tm 2:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.