Abụ Ọma 109:11
Psalms 109:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.
Psalms 109:11 in English
Psalms 109:11 · Berean Standard Bible
May the creditor seize all he owns, and strangers plunder the fruits of his labor.
Context
9Ka ụmụ ya ghọọ ndị na-enweghị nna,
ka nwunye ya bụrụ nwanyị na-enweghị di. 10Ka ụmụ ya ghọọ ndị arịrịọ na-enweghị ebe obibi,
ndị e si na mkpọmkpọ ebe ha bi chụpụ. 11Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere,
ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya. 12Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma;
ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere. 13Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa,
ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.