Native Bible

Psalms 107:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi.

Psalms 107:5 in English

Psalms 107:5 · Berean Standard Bible

They were hungry and thirsty; their soul fainted within them.

Context

3ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda. 4Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi. 5Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi. 6Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile. 7O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.