Native Bible

Psalms 107:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi.

Psalms 107:7 in English

Psalms 107:7 · Berean Standard Bible

He led them on a straight path to reach a city where they could live.

Context

5Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi. 6Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile. 7O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi. 8Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, 9nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.