Abụ Ọma 107:3
Psalms 107:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.
Psalms 107:3 in English
Psalms 107:3 · Berean Standard Bible
and gathered from the lands, from east and west, from north and south.*
Context
1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma;
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a,
ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị, 3ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche,
site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda. 4Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu,
ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi. 5Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ,
olileanya gwụrụ ha nʼobi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.