Native Bible

Psalms 107:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.

Psalms 107:4 in English

Psalms 107:4 · Berean Standard Bible

Some wandered in desert wastelands, finding no path to a city in which to dwell.

Context

2Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị, 3ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda. 4Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi. 5Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi. 6Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.