Native Bible

Psalms 107:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.

Psalms 107:27 in English

Psalms 107:27 · Berean Standard Bible

They reeled and staggered like drunkards, and all their skill was useless.*

Context

25Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu. 26Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri. 27Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a. 28Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile. 29O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.