Native Bible

Psalms 107:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri.

Psalms 107:24 in English

Psalms 107:24 · Berean Standard Bible

They saw the works of the LORD, and His wonders in the deep.

Context

22Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile. 23Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri. 24Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri. 25Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu. 26Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.