Native Bible

Psalms 107:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile.

Psalms 107:17 in English

Psalms 107:17 · Berean Standard Bible

Fools, in their rebellious ways, and through their iniquities, suffered affliction.

Context

15Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, 16nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ. 17Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile. 18Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso. 19Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.