Abụ Ọma 107:16
Psalms 107:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.
Psalms 107:16 in English
Psalms 107:16 · Berean Standard Bible
For He has broken down the gates of bronze and cut through the bars of iron.
Context
14O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta.
O tijikwara agbụ ha niile. 15Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, 16nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ
gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ. 17Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi
taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile. 18Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ
ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.