Native Bible

Psalms 107:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,

Psalms 107:15 in English

Psalms 107:15 · Berean Standard Bible

Let them give thanks to the LORD for His loving devotion and His wonders to the sons of men.

Context

13Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile. 14O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile. 15Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, 16nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ. 17Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.