Native Bible

Psalms 107:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.

Psalms 107:13 in English

Psalms 107:13 · Berean Standard Bible

Then they cried out to the LORD in their trouble, and He saved them from their distress.

Context

11nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu. 12Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ. 13Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile. 14O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile. 15Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.