Abụ Ọma 107:12
Psalms 107:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
Psalms 107:12 in English
Psalms 107:12 · Berean Standard Bible
He humbled their hearts with hard labor; they stumbled, and there was no one to help.
Context
10Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi,
ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ, 11nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke
ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu. 12Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ,
ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ. 13Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,
ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile. 14O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta.
O tijikwara agbụ ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.