Abụ Ọma 107:10
Psalms 107:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ,
Psalms 107:10 in English
Psalms 107:10 · Berean Standard Bible
Some sat in darkness and in the shadow of death, prisoners in affliction and chains,
Context
8Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ
na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, 9nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ
meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ. 10Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi,
ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ, 11nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke
ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu. 12Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ,
ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.