Abụ Ọma 107:11
Psalms 107:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu.
Psalms 107:11 in English
Psalms 107:11 · Berean Standard Bible
because they rebelled against the words of God and despised the counsel of the Most High.
Context
9nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ
meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ. 10Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi,
ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ, 11nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke
ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu. 12Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ,
ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ. 13Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,
ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.