Native Bible

Psalms 106:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,

Psalms 106:26 in English

Psalms 106:26 · Berean Standard Bible

So He raised His hand and swore to cast them down in the wilderness,

Context

24Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya. 25Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị. 26Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara, 27mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile. 28Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.