Abụ Ọma 106:28
Psalms 106:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
Psalms 106:28 in English
Psalms 106:28 · Berean Standard Bible
They yoked themselves to Baal of Peor and ate sacrifices offered to lifeless gods.
Context
26Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi
na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara, 27mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche,
ma chụsasịa ha nʼala niile. 28Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa,
riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja; 29ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe,
nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha. 30Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi,
ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.