Native Bible

Psalms 106:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.

Psalms 106:16 in English

Psalms 106:16 · Berean Standard Bible

In the camp they envied Moses, as well as Aaron, the holy one of the LORD.

Context

14Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa. 15Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha. 16Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị. 17Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya. 18Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.