Abụ Ọma 106:14
Psalms 106:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
Psalms 106:14 in English
Psalms 106:14 · Berean Standard Bible
They craved intensely in the wilderness and tested God in the desert.
Context
12Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile,
ma bụkuo gị abụ otuto. 13Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ,
ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè. 14Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha;
nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa. 15Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya,
ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha. 16Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis
na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.