Abụ Ọma 105:14
Psalms 105:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha;
Psalms 105:14 in English
Psalms 105:14 · Berean Standard Bible
He let no man oppress them; He rebuked kings on their behalf:
Context
12Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
nʼezie ha dị ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼime ya. 13Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ,
sitekwa nʼotu alaeze gaa alaeze ọzọ. 14O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
ọ baara ndị eze mba nʼihi ha; 15sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka;
unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.” 16O zitere ụnwụ nʼala ahụ,
bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.