Native Bible

Psalms 104:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.

Psalms 104:21 in English

Psalms 104:21 · Berean Standard Bible

The young lions roar for their prey and seek their food from God.

Context

19I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa. 20Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị. 21Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha. 22Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha. 23Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.