Native Bible

Psalms 104:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.

Psalms 104:23 in English

Psalms 104:23 · Berean Standard Bible

Man goes forth to his work and to his labor until evening.

Context

21Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha. 22Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha. 23Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba. 24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. 25Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.