Abụ Ọma 104:20
Psalms 104:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.
Psalms 104:20 in English
Psalms 104:20 · Berean Standard Bible
You bring darkness, and it becomes night, when all the beasts of the forest prowl.
Context
18Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;
nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha. 19I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;
anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa. 20Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;
ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị. 21Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,
ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha. 22Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,
ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.