Abụ Ọma 104:15
Psalms 104:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
Psalms 104:15 in English
Psalms 104:15 · Berean Standard Bible
wine that gladdens the heart of man, oil that makes his face to shine, and bread that sustains his heart.
Context
13Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;
ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya. 14Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,
na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,
ime ka nri site nʼala pupụta; 15mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,
mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,
na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi. 16A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,
osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ. 17Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;
nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.