Abụ Ọma 104:14
Psalms 104:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta;
Psalms 104:14 in English
Psalms 104:14 · Berean Standard Bible
He makes the grass grow for the livestock and provides crops for man to cultivate, bringing forth food from the earth:
Context
12Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;
nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ. 13Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;
ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya. 14Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,
na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,
ime ka nri site nʼala pupụta; 15mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,
mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,
na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi. 16A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,
osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.