Abụ Ọma 103
Psalms 103 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
echefukwala mmeso ọma ya niile, 3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;
na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, 4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu
werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, 5onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile,
ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.* 6Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume,
na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. 7O mere ka Mosis mata ụzọ ya,
mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche: 8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.
Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; 10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị,
ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. 11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. 12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ,
otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ. 13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ,
otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, 14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị,
ọ na-echeta na anyị bụ aja. 15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa,
ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, 16ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa,
adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya. 17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site
nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.
Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha, 18nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya
na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi. 19Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe,
alaeze ya na-achị ihe niile. 20Toonu Onyenwe anyị, unu ndị mmụọ ozi ya,
unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ,
na-erubere okwu ya isi. 21Toonu Onyenwe anyị unu usuu ndị agha ya niile;
unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya. 22Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile
nʼebe ọbụla ọ na-achị.
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
103:5 Ugo Ọ bụ ịdị ike na ndụ ogologo ka e ji mara nnụnụ ugo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.