Abụ Ọma 103:7
Psalms 103:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ka Mosis mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche:
Psalms 103:7 in English
Psalms 103:7 · Berean Standard Bible
He made known His ways to Moses, His deeds to the people of Israel.
Context
5onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile,
ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.* 6Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume,
na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. 7O mere ka Mosis mata ụzọ ya,
mekwaa ka ụmụ Izrel mara ọrụ ya dị iche iche: 8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.
Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.