Native Bible

Psalms 102:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya.

Psalms 102:16 in English

Psalms 102:16 · Berean Standard Bible

For the LORD will rebuild Zion; He has appeared in His glory.

Context

14Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere. 15Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. 16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. 17Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. 18Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.