Native Bible

Psalms 101:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.

Psalms 101:4 in English

Psalms 101:4 · Berean Standard Bible

A perverse heart shall depart from me; I will know nothing of evil.

Context

2Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m. 3Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya. 4Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla. 5Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga. 6Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.