Abụ Ọma 101:4
Psalms 101:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.
Psalms 101:4 in English
Psalms 101:4 · Berean Standard Bible
A perverse heart shall depart from me; I will know nothing of evil.
Context
2Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla,
olee mgbe ị ga-abịakwute m?
Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla
jegharịa nʼime ụlọ m. 3Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya
nʼihu m.
Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.
Agaghị m enwekwa oke nʼime ya. 4Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.
Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla. 5Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,
onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;
agaghị m anabata
onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga. 6Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya,
ka mụ na ha biri;
onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla
ga-ejere m ozi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.