Abụ Ọma 101:3
Psalms 101:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.
Psalms 101:3 in English
Psalms 101:3 · Berean Standard Bible
I will set no worthless thing before my eyes. I hate the work of those who fall away; it shall not cling to me.
Context
1Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;
o Onyenwe anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto. 2Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla,
olee mgbe ị ga-abịakwute m?
Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla
jegharịa nʼime ụlọ m. 3Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya
nʼihu m.
Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.
Agaghị m enwekwa oke nʼime ya. 4Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.
Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla. 5Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,
onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;
agaghị m anabata
onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.