Abụ Ọma 101:5
Psalms 101:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.
Psalms 101:5 in English
Psalms 101:5 · Berean Standard Bible
Whoever slanders his neighbor in secret, I will put to silence; the one with haughty eyes and a proud heart, I will not endure.
Context
3Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya
nʼihu m.
Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.
Agaghị m enwekwa oke nʼime ya. 4Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.
Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla. 5Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,
onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;
agaghị m anabata
onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga. 6Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya,
ka mụ na ha biri;
onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla
ga-ejere m ozi. 7Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ
agaghị ebi nʼụlọ m;
onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha
agaghị eguzokwa nʼihu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.