Native Bible

Proverbs 31:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Enyela ụmụ nwanyị* ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.

Proverbs 31:3 in English

Proverbs 31:3 · Berean Standard Bible

Do not spend your strength on women or your vigor on those who ruin kings.

Context

1Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya. 2Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile. 3Enyela ụmụ nwanyị* ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi. 4Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze. 5Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.