Native Bible

Proverbs 31:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.

Proverbs 31:1 in English

Proverbs 31:1 · Berean Standard Bible

These are the words of King Lemuel—the burden that his mother taught him:

Context

1Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya. 2Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile. 3Enyela ụmụ nwanyị* ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.