Ilu 31:4
Proverbs 31:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
Proverbs 31:4 in English
Proverbs 31:4 · Berean Standard Bible
It is not for kings, O Lemuel, it is not for kings to drink wine, or for rulers to crave strong drink,
Context
2Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m.
Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile. 3Enyela ụmụ nwanyị* ike gị,
enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi. 4Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya.
O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya
bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze. 5Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru.
Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta. 6Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi,
ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.